Mpịakọta Nke Anọ nwere omenala mmụọ dị omimi nke e nyere ụmụ mmadụ, bụ nke dị n'obi Ozi Ọhụrụ.

Nke a bụ ederede ntọala nke nkuzi banyere Chineke na nke omume mmụọ nke Ozi Ọhụrụ. Ọ gụnyere akwụkwọ ndị bụ Omume Mmụọ nke Obodo Ukwu na Mmekọrịta na Nzube Ka Elu. Marshall Vian Summers natara ederede ndị a pụrụ iche ma dịkwa nsọ n'usoro mkpughe nke na-aga n'ihu.

N'ime ederede ndị a, a na-akọwara ụmụ mmadụ Ụzọ Ihe Ọmụma nke Obodo Ukwu, bụ ụzọ omume mmụọ na ntolite ime mmadụ nke a na-agbaso na mbara ụwa niile kemgbe oge ochie. A na-eweta Ụzọ Ihe Ọmụma nke Obodo Ukwu nye ụwa anyị ugbu a maka nke mbụ.

Ederede ndị a na-edo isi nkuzi nye ụwa banyere Ihe Ọmụma (Gịnị bụ Ihe Ọmụma?), banyere Obodo Ukwu (Gịnị bụ Obodo Ukwu?) na banyere Mmekọrịta na Nzube Ka Elu, tinyere nkuzi ndị bụ mkpụrụ banyere ọdịdị nke ọnụnọ na nzube Chineke n'ụwa nakwa na mbara ụwa dị n'ofe ya.

Ọ bụ ezie na ederede ndị a na-eme ka ntọala mmụọ nke Ozi Ọhụrụ sikwuo ike, ha na-adakarị ka oku dị omimi ma dịkwa nso nke ike na ihe omimi n'ime mmadụ n'otu n'otu. Oku a nwere ike ịda ụda gafee ụzọ ochie niile nke uche mmadụ, na-akpọ oku nye Ihe Ọmụma dị omimi na ncheta ochie nke bi n'ime anyị na-eche ka a chọpụta ya.

Akwụkwọ

Mpịakọta 4