---
# --- identity
title: "Njem Mkpụrụ Obi n'Ụwa"
work: "The New Message from God"
locale: "ig"
# --- place in the work
volume: 1
volume_title: "Mpịakọta 1"
book: "Ike nke Ihe Ọmụma"
chapter: 3
# --- provenance
received_by: "Marshall Vian Summers"
received: "2008-10-25"
received_location: "Boulder, Colorado"
# --- addresses: cite `url`, fetch `markdown_url`
url: "https://newmessage.org/ig/the-message/volume-1/power-of-knowledge/souls-journey-through-life/"
markdown_url: "https://newmessage.org/ig/the-message/volume-1/power-of-knowledge/souls-journey-through-life.md"
# `{locale}` is a prefixed language code; English is at markdown_url_en
markdown_url_pattern: "https://newmessage.org/{locale}/the-message/volume-1/power-of-knowledge/souls-journey-through-life.md"
markdown_url_en: "https://newmessage.org/the-message/volume-1/power-of-knowledge/souls-journey-through-life.md"
translations: ["en", "es", "it", "nl", "bg", "ko", "tr", "vi", "sl", "ru", "de", "ar", "sk", "ur", "pcm"]
# --- terms
usage: "Read and quote freely. Name the source and link to the canonical URL."
---

# Njem Mkpụrụ Obi n'Ụwa

> Chapter 3 of *Ike nke Ihe Ọmụma*, Volume 1 of **The New Message from God**.
> As received by Marshall Vian Summers on October 25, 2008 in Boulder, Colorado.
> Source: https://newmessage.org/ig/the-message/volume-1/power-of-knowledge/souls-journey-through-life/
> Read and quote freely. Name the source and link to the canonical URL.

Ị na-eme njem gafee oge na oghere, ị nọ na njem ogologo nke ịlaghachi n'Ebe Obibi Ochie gị. Na ndụ a nakwa n'ihe gafere ya, njem a na-aga n'ihu. Ọ bụghị njem ị na-eme naanị maka onwe gị. Ọ bụ njem ị na-eme maka ndị niile kwụsịrị inwe njikọ na Onye Okike nke ndụ niile. Ọ bụ njem nke Nkewa na nke nlọghachi. Ọ bụ njem na-eje ruo n'ahụmahụ ka ukwuu nke nzube gị na akaraka gị.

Njem a dị nnọọ iche na ihe ndị mmadụ na-echepụta n'uche ha, n'ihi na nchepụta uche apụghị ijide eziokwu buru ibu otu a. Okwu, dị ka echiche, na-etinye oke na ụdị n'ihe niile, ma ha apụghị ijide eziokwu ndị ka ukwuu. Nke a chọrọ nsọpụrụ na obi ịdakọ tupu mmadụ enweta ahụmahụ nke eziokwu n'ọkwa buru ibu. Echiche na nkwenye zuru oke maka ihe ndị nta. Ma eziokwu ka ukwuu—ya bụ eziokwu nke njem gị gafee oge na oghere—karịrị ihe nchepụta uche gị ma ọ bụ ọgụgụ isi gị pụrụ iche n'oge a.

Naanị ihe atụ ka mmadụ pụrụ inye ebe a. Ma ihe atụ apụghị ijide ọhụụ ka ukwuu nke ndụ ahụ ị bụ akụkụ ya, ma ọ bụ ijide ihe njem gị gafee ndụ a nakwa ihe gafere ya pụtara. Obi pụrụ ịghọta, ma uche apụghị ijide eziokwu buru ibu otu a n'ọkwa nke echiche nke ya. Ọ bụ ya mere eziokwu ahụ ji dị nnọọ iche na ihe ọtụtụ mmadụ na-eche ma na-ekwere.

Mgbe Nkewa site na Chineke malitere, ị pụghị ikewapụ onwe gị kpamkpam n'ihi na otu akụkụ nke Okike dị n'ime gị ma nọgidesie ike n'ime gị, ị pụghịkwa iwepụ ya. Ọ dị ka a ga-asị na Chineke na-eso gị na njem ahụ. Ebe ọ bụla ị gara, Chineke nọ ebe ahụ, n'ime gị na gburugburu gị. Ị nwere ike ịsị, “Achọghị m ikwere na Chineke. Achọghị m ihe ọ bụla gbasara okpukpe.” Nke ahụ adịghị njọ, ma Chineke ka nọ n'ime gị, Chineke nọkwa gburugburu gị.

Ị nwere ike iche na Chineke bụ naanị ihe gbasara onye nkuzi a—onye nzọpụta m, onye nsọ m, onye amụma m—ma Chineke ka nọ n'ime gị na gburugburu gị.

Ị nwere ike ikwu na Chineke bụ onye kpatara ihe ndị na-eme n'ụwa ma ọ bụ ihe ndị na-eme na ndụ gị, ma Chineke ka nọ n'ime gị na gburugburu gị.

Uche na-eche echiche, uche na-adụ ndị ọzọ ọdụ, uche na-ekwusa eziokwu ukwu dị ka ahụmahụ ya na oke nghọta ya si dị, ma eziokwu ahụ karịrị nke a.

E kewapụrụ gị n'ime uche nke gị, ọgụgụ isi bụkwa ihe si na Nkewa a pụta. Ọ na-eche na ya bụ onye ị bụ. Ọ na-eche na ya maara ihe eziokwu bụ. Ọ na-eche na ya bụ mkpụrụ obi gị na Ọdịdị gị. Ọ na-eche na echiche ya na-anọchi anya eziokwu ya ma na-eme ka ọ dị iche na uche ndị ọzọ nwere echiche ndị ọzọ. Uche gị na-eche na eziokwu ya bụ eziokwu nke echiche ya na nke mmekọrịta ya na ndị mmadụ, na ebe na ihe ndị dị iche iche. Ma onye ị bụ n'ezie karịrị ihe ndị a niile.

N'ihi na Chineke anọgidewo n'ime gị, Ihe Ọmụma nke Chineke anọgidewo n'ime gị. Ihe Ọmụma a nọkwa ebe a ugbu a iji duzie gị, chebe gị ma dubaa gị n'ahụmahụ ndụ ka ukwuu, ka Nkewa dị n'ime gị wee gbazee. Nzube a na akaraka a nke Ihe Ọmụma jidere maka gị bụ itinye aka n'ụwa nọ na mkpa, n'ime otu ọnọdụ ndị ị na-ahụ taa nakwa ndị ga-ebilite n'ọdịnihu.

N'ebe Ihe Ọmụma dị n'ime gị si ele ya anya, ị nọ ebe a maka otu ọrụ. Ị nwere nzube ka ukwuu maka ịnọ ebe a. Ị bụghị naanị anụmanụ na-agbalị ịdị ndụ, na-agbalị inwe afọ ojuju, na-agbalị inwe obi ụtọ, na-agbalị ịnọ na nchebe. Ị bụ Ọdịdị si n'Eluigwe, onye so na Nkewa, onye nọzi ebe a ịrụ ọrụ maka ịchọpụta onwe gị na mgbapụta gị.

Ka uche gị na-aga n'ihu na-agbalị ịghọta onwe ya ma jikọta onwe ya na ndị mmadụ, na ebe na ihe ndị dị iche iche, Ihe Ọmụma dị n'ime gị na-akwaga. Ọ na-adụ gị ọdụ, ọ na-enye gị ndụmọdụ. Ọ bụrụ na ị nwere ike ịnụ ya, ị ga-erite uru na ya. Ma ọ bụrụ na ị pụghị ịnụ ya, mgbe ahụ ị pụghị inweta amamihe ya, ngọzi ya na ike ọ na-enye.

Ihe ịga nke ọma gị na ndụ a anaghị atụba gị n'Eluigwe ma ọ bụ na Hel, kama ọ na-etinye gị n'ọkwa ọzọ nke njem gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwetaghachi amamihe na ọmịiko na ụfọdụ nghọta banyere onwe gị, mgbe ahụ a ga-akwadebe gị maka ọkwa ije ozi ka ukwuu.

Ndị mmadụ na-eche na naanị otu ndụ a bụ ịdị adị ha niile n'ụwa anụ ahụ. Ụfọdụ mmadụ na-echedị na ụwa anụ ahụ ga-akwụsị kpamkpam n'oge ndụ ha. Echiche ndị a bụ ihe si n'oke nke nchepụta uche gị pụta. Ịghọta na ndụ gị ga-aga n'ihu gafee nke a banye n'ọkwa ndụ ndị ọzọ na n'ọkwa ije ozi ndị ọzọ bụ ihe siri ọtụtụ mmadụ ike ịtụlee. Ha enweghị ike iche echiche n'ọkwa a.

Ya mere e ji chepụta echiche nke Ụbọchị Ikpe. Ma gịnị mere Chineke ga-eji kpee gị ikpe mgbe Chineke maara nke ọma ihe mere i ji na-eme ihe ị na-eme, na mgbe Chineke ghọtara na ụwa bụ ebe nsogbu na nrafu dị ukwuu nke na, ma ọ bụrụ na Ihe Ọmụma adịghị iduzi mmadụ ebe a, ọ ga-adaba na njehie n'ezie, mgbe ụfọdụ njehie dị oke njọ?

Chineke agaghị ata gị ahụhụ maka ibi ndụ n'ọnọdụ dị otu a. Chineke ga-akpọ gị ka ị bịakwute Ihe Ọmụma dị n'ime gị, ka i wee nwee Ike na Ọnụnọ nke Chineke iji duzie gị, chebe gị ma duga gị n'ihu.

Ụbọchị Ikpe adịghịzi. Nke a bụ ihe ndị mmadụ chepụtara n'ihi na ha chọrọ ka e mee ikpe ziri ezi n'Eluigwe ebe a na-emeghị ya n'Ụwa, dị ka echiche ha si dị banyere ihe ikpe ziri ezi kwesịrị ịbụ. Ha chọrọ ka a taa ndị ajọ omume ahụhụ, ọ bụrụgodi na ha onwe ha apụghị ịta ndị ha chere na ha mejọrọ ahụhụ. Nke a bụ naanị ihe ha si n'ime onwe ha atụpụ.

E kwalitewo echiche nke Chineke na-ewe iwe kemgbe oge n'ọtụtụ omenala iji manye ndị mmadụ ka ha kwenye, iji mee ka ụjọ tụọ ha ka ha kwere n'otu echiche okpukpe ma ọ bụ n'otu nkuzi. Ndị mmadụ na-efe Chineke, echiche ha niile banyere Chineke dabekwara n'ụdị uche ohu ebe ị ga-emerịrị Chineke obi ụtọ ma ọ bụghị ya, Chineke ga-ata gị ahụhụ. Chineke ga-emebi ihe ọkụkụ gị. Chineke ga-eweta ọrịa na-efe efe. Chineke ga-eweta ihu igwe na-emebi ihe. N'ihi ya, ka oge na-aga, ndị mmadụ na-eche na ha aghaghị ime Chineke obi ụtọ ma ọ bụghị ya, ha ga-eche ihe ọjọọ ihu ebe a n'Ụwa.

Ma eziokwu bụ na ha abanyela n'ụwa nke siri ike nke ukwuu ma jupụta na nsogbu site n'ọdịdị ya, ụwa nke a na-apụghị ịkọ ihe ọ ga-eme, nke, ọ bụ ezie na ọ na-eso usoro ndị bụ isi, jupụtara n'ọgba aghara.

Nke a bụ mbara ụwa nke anụ ahụ, bụ nke e kere ka ọ bụrụ ebe ndị e kewapụrụ ekewapụ ga-ebi, n'ụwa dị iche. Ọ dị ịtụnanya ma dịkwa egwu, ọ maka ma na-eyikwa ụjọ. Ọ na-adọrọ mmasị ma, n'ọnọdụ ụfọdụ, na-asọ oyi. Ọ dị nnọọ iche na Ebe Obibi Ochie gị ebe i si bịa na ebe ị ga-emesịa laghachi. Ma otu ọ dị, ọ bụ ebe chọrọ ntinye aka. Ọ bụ ebe omume. Ọ bụ ebe inye onyinye. Ọ bụ site n'ebe a ka mkpụrụ obi aghaghị ime njem ugbu a.

Ị nọ n'ụwa maka nzube ka ukwuu. Ọ bụghị gị chepụtara ya maka onwe gị. Ị pụghị ịgbanwe nzube a, ma otu a ga-esi nweta ahụmahụ ya, na ma a ga-enweta ya, dabere n'ihe ndị na-eme n'oge nakwa na mkpebi nke gị banyere ya. Ya mere, ọ bụ ezie na e bu ụzọ kpebie nzube gị, e kpebibeghị ihe ndị ga-eme na ndụ gị. N'ọkwa ịdị adị a, ihe mberede na-ekere oke buru ibu, mkpa nke mkpebi gị na-ekerekwa oke buru ibu.

Ụfọdụ mmadụ chọrọ iche na Chineke na-achịkwa ihe niile na-eme na ndụ, ma nke ahụ abụghị eziokwu ma ọlị. Chineke emeela ka ike ndị gbasara ala na ndị gbasara ihe dị ndụ malite ịrụ ọrụ, bụ ndị kpụziri ntolite nke ndụ. Ma ike ndị a na-aga n'ihu n'onwe ha, ha achọghịkwa ka Chineke tinye aka. Ya mere, ọ bụrụ na ala ọma jijiji emee, ọ bụ akụkụ nke usoro ala. Ọ bụrụ na ụnwụ na ọrịa na-efe efe emee, ọ bụkarị ihe si n'ike ndị ị na-apụghị ịchịkwa pụta.

Chineke anaghị ata gị ahụhụ. Ma nke a bụ ụwa ebe ị ga-ahọrọ. Ọ bụ ma ị ga-ahọrọ Njikọ Ọzọ na Chineke ka ị ga-ahọrọ Nkewa site na Chineke. Ị na-ahọrọ nke a kwa ụbọchị. Ị na-ahọrọ ya n'ihe ị na-ahọrọ iche echiche banyere ya, n'ihe ị na-ahọrọ ikwere na ya, na n'otu ị na-ahọrọ isi zaa nsogbu na mkpebi ndị dị na ndụ.

E kpụrụ uche gị na mkpọchi, ya mere ọ na-ekwere na ya bụ ihe naanị ya, ihe dị iche na ihe ndị ọzọ. Ọ na-eme ka onwe ya dị iche ma na-agbalị iji ahụ mee ka onwe ya dị iche. Ọ bụ ihe si na Nkewa pụta, ọ na-emekwa ka Nkewa sikwuo ike. Ma i nwekwara Ihe Ọmụma dị omimi n'ime gị, Ihe Ọmụma dị omimi nke Chineke tinyere ebe ahụ. A pụghị ime ka o kwenye. A pụghị ịrafu ya. A pụghị ime ka o mee ihe ndị megidere isi ọdịdị ya.

Ọ dị ka a ga-asị na i nwere olu abụọ n'ime uche gị. I nwere ike inwe olu karịrị abụọ, ma ha niile na-abịaru na ịbụ olu maka Nkewa ma ọ bụ olu maka Njikọ Ọzọ. Ma olu maka Njikọ Ọzọ anaghị eche echiche dị ka uche gị. Ọ naghị atụle ihe ogologo oge. Ọ naghị eme atụmatụ efu. Ọ naghị ekpe ikpe ma maa ikpe. Ọ naghị adabere eziokwu ya n'echiche ma ọ bụ n'ụkpụrụ ma ọ bụ n'ọnọdụ nkwado.

Uche gị nke elu—ya bụ uche gị nke omenala kpụziri, nke ezinụlọ gị kpụziri, nke odinala kpụziri na nke otu i si aza ụwa na-agbanwe agbanwe kpụziri—uche a aghaghị ijere Uche Ka Ukwuu dị n'ime gị ozi ma ọ bụrụ na a ga-agbapụta ya na ọ bụrụ na a ga-eji ike ukwu ya rụọ ọrụ bara uru maka gị na maka ndị ọzọ.

Ọ bụ ya mere e ji tinye Ihe Ọmụma n'ime gị iji duzie gị. N'ihi na Chineke maara na ị ga-efu efu n'ụwa ma Ihe Ọmụma a adịghị. Ị ga-adaba na njehie, ị ga-ebikwa ndụ nke esemokwu, nke nsogbu na nke ịjụ onwe gị.

Njem gị, mgbe ahụ, bụ ịlaghachi n'ike na ọnụnọ nke Ihe Ọmụma. Ma ọ bụ, n'okwu ndị ọzọ, ọ bụ ịbụ onye kwesịrị ntụkwasị obi n'ebe akọnuche gị dị omimi nọ, onye eziokwu nye onwe gị, onye eziokwu nye ihe ị kacha na-enwe mmetụta ya ma mara ya n'ime obi gị. A pụrụ ịkọwa nke a n'okwu okpukpe ma ọ bụ n'okwu na-abụghị nke okpukpe, ma ọ bụ otu ihe ahụ.

Site n'Ihe Ọmụma, ị na-achọpụta na ị nọ ebe a maka nzube ka ukwuu, ị na-ahụkwa na a na-eduzi gị n'ụzọ ụfọdụ ma na-egbochi gị n'ụzọ ndị ọzọ. Ka ntụkwasị obi gị na-abawanye, ị nwere ike iso nke a ma nata ngọzi ukwu ya na ihe ukwu ọ na-akụziri gị banyere ndụ. Ị na-eme nke a n'amaghị onwe gị ma ọ bụ ndị ọzọ ikpe. Ị na-eme ya n'obi umeala, na-aghọta na ị na-eso ike ka ukwuu, ike nke karịrị oke na aka nke ọgụgụ isi. Ị na-edo onwe gị ebe a dị ka nwa akwụkwọ, nwa akwụkwọ nke na-eche na ya maara ihe nta ma na-emeghe onwe ya ịmụta ihe niile a ga-amụta.

Ebe a, ị naghị ebi ndụ dị ka azịza si dị, kama ị na-ebi ndụ na ajụjụ. Ọgụgụ isi apụghị ime nke a, n'ihi na o nweghị nchekwa ma ọlị. Ọ ga-enwerịrị azịza, ya mere ọ na-enye azịza nke ya. O nweghị nchekwa. Ọ dị nnọọ ike ọgwụgwụ ibi ndụ na ajụjụ. Nke ahụ chọrọ ike ka ukwuu n'ime gị. Ị na-ebi ndụ na ajụjụ ị pụghị ịza ma ọlị, ma ị na-ebi ndụ na ha n'ihi na ha na-emeghe uche gị, ha na-akpalikwa njikọ dị omimi na Ihe Ọmụma dị n'ime gị.

Ihe Ọmụma bụ azịza ya, n'ihi na ka ị na-esiwanye ike na Ihe Ọmụma, ị na-enwe ntụkwasị obi ka ukwuu, ị na-enwe obi ike ka ukwuu, ị na-enwekwa ike na ikike ka ukwuu. Ị pụrụ iche ihe ize ndụ na ọnọdụ ejighị n'aka ihu n'enweghị iwe na mmama ikpe. Ị pụrụ iche ajụjụ ndị ị na-enweghị azịza ha ihu site n'ịjụ ase, imeghe obi na obi umeala. Ị nwere ike igbochi agwa ndị na-emebi gị ma mata ọdịiche dị n'etiti echiche ndị dị n'uche gị bụ ndị bara ezigbo uru na echiche ndị niile ị nakọtara na gburugburu gị.

Ọ bụrụ na ị sie ike na Ihe Ọmụma na ndụ a, a ga-enye gị ọkwa ije ozi ka ukwuu gafee ụwa a. Nke a nwere ike ịbụ ije ozi n'ụwa a ma ọ bụ n'ụwa ndị ọzọ. Ọ nwere ike ịbụ ije ozi dị ka onye nkuzi nke gafere anụ ahụ, otu n'ime Ndị A Naghị Ahụ Anya bụ ndị na-eduzi ndị ka bi n'ime ahụ. Ma ọ bụ ị nwere ike ịlaghachi n'ụwa a a na-ahụ anya dị ka onye nkuzi ukwu, dị ka onye nwere nkwa ukwu ịwụsa amamihe na nduzi na ngwọta n'ịdị adị ọzọ.

Ebe a, Ụbọchị Ikpe adịghị. Naanị ọganihu dị. Ị pụghị ịlaghachi n'ọnọdụ eluigwe gị ebe iwe, ọnụma, ikpe onwe gị ikpe na mmama ndị ọzọ ikpe juru gị obi. Ị pụghị ịlaghachi n'ọnọdụ eluigwe gị ebe enweghị mkpebi na obi abụọ juru gị obi, tinyere agụụ ihe ọjọọ na agwa ndị na-emebi gị. Ị pụghị nnọọ ịlaghachi n'ọnọdụ uche dị otu a.

Iche na a pụrụ idozi ihe ndị a niile n'ime otu ndụ bụ ileda nsogbu ahụ anya. Ọ bụrụgodi na i nwere ike idozi ihe ndị a niile n'otu ndụ, ihe i mezuru ga-adị ukwuu nke na Chineke ga-achọ iji gị nyere ndị ọzọ ka fụrụ efu n'ọnọdụ Nkewa ha aka. Ya mere ị gaghị enwe ike ịlaghachi n'Eluigwe ọbụna n'ọnọdụ ndị a.

Chineke ga-eji gị rụọ ọrụ nke ukwuu, ọ ga-eritekwa uru nke ukwuu n'amamihe ọ bụla ị pụrụ inweta n'ibi ndụ n'ụwa anụ ahụ. Nke a abụghị ntaramahụhụ, n'ihi na ihe na-akagbu agwa niile na ncheta niile na nhụjuanya niile sitere na Nkewa bụ ntinye aka, bụ ije ozi. Chineke anaghị agbaze ihe ndị a niile n'ime gị n'ihi na ọ bụghị Chineke kere ha. Ha aghaghị ịgbaze n'ime gị, site na gị na site n'aka gị, site n'iso ụzọ dị iche na ndụ.

Ije ozi na-anọchi njehie gị. Ije ozi ahụ si n'ime ime obi gị pụta. Ọ bụghị atụmatụ i chepụtara iji gbalịa ikpochapụ ikpe ọmụma dị n'ime gị. Ọ bụ ihe si n'Ihe Ọmụma dị n'ime gị na-asọpụta. Ọ na-eji ncheta ntinye aka, nkwurịta okwu na njikọ gị na ndị ọzọ nọchie ncheta nke Nkewa. Ọ bụ site n'iso ezigbo onye nwe dị n'ime gị ka a na-ehichapụ ma chefuo njehie ndị i mere na mkpebi gị nakwa ahụmahụ ndị wutere gị.

Ndị mmadụ apụghị ịhụ nke a n'ihi na ha apụghị ichepụta n'uche otu Eluigwe dị. Mgbe ị na-ebi n'ụwa, na-eche na ị bụ naanị otu onye, ị pụghị ichepụta n'uche otu Eluigwe dị. N'ihi na ọ bụ site na nchepụta uche ka i si enye echiche gị ụdị, ụdị ahụ bụkwa nke oke dị ya nke ukwuu ma bụrụ nke nwa oge. Ọ bụ ya mere ị pụghị iji nchepụta uche jide ihe ndị na-adịgide. Ị pụghị ichepụta udo n'uche. Ihe niile ị na-echepụta n'uche bụ ihe nwere oke ma bụrụ nke nwa oge site n'ọdịdị ya.

Ahụmahụ gị banyere nke a na-eme n'ọkwa dị omimi. Uche pụrụ naanị ichepụta ihe ndị ọ pụrụ iche n'echiche. Ma ọ bụrụ na ọ pụghị iche echiche banyere Okike ma e wezụga n'okwu ndị oke dị ya nke ukwuu n'ime oge na oghere, mgbe ahụ o doro anya na ị ga-enwerịrị ahụmahụ nke ọdịdị gị dị omimi gafee ala nke ọgụgụ isi gị.

Ọgụgụ isi gị bụ otu i si eleba ndụ anya site n'ọnọdụ Nkewa. Ma ọ bụrụ na Nkewa abụghị eziokwu, na ọ pụghị izu oke mgbe ọ bụla, mgbe ahụ echiche gị aghaghị ịbụ ihe dabere n'ọnọdụ. Ma eleghị anya ị pụrụ ịhụ eziokwu nke ihe ndị dị n'oge, nke ihe ndị na-adị nwa oge. Ị pụrụ idozi nsogbu n'ihi na nke ahụ bụ ihe e ji ọgụgụ isi eme. Ọ bụ idozi nsogbu n'ime oke ahụmahụ gị nwere na ndụ a.

Nke a bụ ezigbo uru nke ọgụgụ isi. Mgbe ọ na-ejere Ihe Ọmụma ozi, ọ bụ ngwa nkwurịta okwu magburu onwe ya. Nke ahụ bụ ihe e ji ya eme, nke ahụ bụkwa ihe na-agbapụta ya ma na-enye ya nzube ka ukwuu na uru ka ukwuu.

Obi ụtọ gị na ndụ ga-esi na njikọ gị na Ihe Ọmụma pụta, na ije ozi ukwu ọ ga-eji gị rụọ, nakwa mgbapụta ọ ga-enye uche gị na mmetụta obi gị. N'ikpeazụ, ị ga-amalite inwe mmetụta na ihe niile dị mma n'ime gị ma napụta onwe gị n'ahụ erughị ala ndị soro gị na mbụ. Ọ ga-atọhapụ gị site n'inyefe ndụ gị nye ndị mmadụ na ihe na ebe n'ụzọ na-ekwesịghị na tupu oge eruo. Ọ ga-atọhapụ gị site na nhụjuanya niile nke enweghị mkpebi, nke iji onwe gị n'obi abụọ na nke ịta onwe gị ụta. Ọ ga-eme nke a nwayọọ nwayọọ n'ihi na ịgbanwe na-ewe oge, ịkwaga nkwado gị n'ime onwe gị—ịkwaga ya site n'echiche gị na echiche ndị ọzọ gaa n'ike dị omimi nke na-eduzi gị site n'ime gị. Ị na-amalite ịmata ike a n'ime ndị ọzọ ma hụ mkpa ọ dị n'etiti ndụ gị nakwa n'ọdịmma nke ụmụ mmadụ niile.

Ọ dịghị mkpa ka i chegbuo onwe gị banyere ihe dị gafee ụwa, n'ihi na i rubeghị ebe nzukọ ahụ. Uche gị apụghị ịghọta ndụ gị tupu ụwa a ma e wezụga n'okwu akụkọ ihe mere eme na n'okwu nchepụta uche. Ma eleghị anya ị ga-enwe ncheta ụfọdụ nke ihe ndị mere na mbụ, ha nwekwara ike ịbụ eziokwu. Ma ha anọghị n'ebe ha kwesịrị ịnọ, ị pụghịkwa ịghọta ha nke ọma.

Ọ bụ ndụ a ka ị ga-etinye uche gị. Ị nọ ebe a maka nzube ka ukwuu. Naanị Ihe Ọmụma dị n'ime gị maara ihe nzube a bụ, ọ na-ejidekwara gị nzube a.

Nke a bụ njem ị na-eme, ị na-emekwa ya nzọụkwụ na nzọụkwụ, n'ọkwa n'ọkwa. Ka Ihe Ọmụma na-apụta n'ime gị, na ka i nwere ike iso ya n'ihe ndị akọwapụtara, ahụmahụ gị banyere ya ga-esiwanye ike. Ị ga-aghọtakwa na e tinyela mgbapụta n'ime gị iji duzie gị, nakwa na mgbapụta abụghị naanị ihe si n'ikwere n'ụkpụrụ ma ọ bụ n'ịnabata nkuzi ma ọ bụ n'ime omume ngosipụta nsọpụrụ nye ike kachasị elu na mbara ụwa pụta. N'ezie, ọrụ dịịrị gị n'ebe Chineke nọ bụ ịchọpụta, ịnabata na igosipụta nzube ka ukwuu a butere gị n'ụwa. Iji mee nke a, ị ga-esorịrị Ihe Ọmụma, na-ekwe ka Ihe Ọmụma bụrụ ihe omimi, n'ihi na ọ dị adị gafee ala nke ọgụgụ isi gị.

Nke a na-eduga na nleghachi anya ukwu na ndụ gị. N'ihi na site n'Ihe Ọmụma, ị na-ahụ ihe n'ụzọ dị iche, ihe ndị dị gị mkpa na-agbanwe, ihe ndị i buru ụzọ na-agbanwekwa. Ma eleghị anya, ị nwetalarị ụfọdụ n'ime mgbanwe a.

Mgbe ị malitere inweta ahụmahụ Ihe Ọmụma, ị na-achọ jụụ kama ịchọ ihe na-akpali akpali. Ị na-achọ mmekọrịta ziri ezi na ndị ọzọ kama mkparịta ụka na-enweghị isi. Ị na-achọ ahụmahụ nke njikọ na mmekọrịta kama iji onye ọzọ eme ihe iji rite uru nye onwe gị. Nghọta ime gị dị gị mkpa karịa echiche gị. Ka oge na-aga, ị na-amalite ịhụ na onye ị bụ abụghị uche gị, nakwa na uche gị bụ n'ezie ngwa nkwurịta okwu magburu onwe ya maka Mmụọ, maka Ihe Ọmụma. Ị na-ahụ ahụ gị dị ka ụgbọ maka ịnọ n'ụwa, ụgbọ nke nkwurịta okwu pụrụ isi na ya sọọ, nke ntinye aka pụrụ isi na ya mee, nakwa nke a pụrụ isi na ya nweta ahụmahụ mmekọrịta dị omimi na ndị ọzọ nọ ebe a n'ụwa.

Ị nọ ebe a na njem n'ụwa. Ị nwere nhọrọ ma ị ga-efu efu n'ụwa ka ị ga-enweta ahụmahụ nke nzube na eziokwu ka ukwuu n'ime ịnọ n'ụwa. Ụzọ abụọ ndị a na-eweta ahụmahụ ndụ dị nnọọ iche n'ebe ibe ha nọ. Ị pụrụ ilegharị anya gburugburu gị ịhụ ihe ndị na-esite na ya pụta, bụ ndị ndị mmadụ na-ahọrọ ibi ndụ na Nkewa na-egosipụta n'ụzọ doro anya, nakwa nhụjuanya na enweghị ntụkwasị obi na mkpebi ndị na-eweta ọdachi bụ ndị si n'ịnara na ijigide ọnọdụ a pụta.

Ọ bụrụ na i lee anya, ị ga-achọpụta na ndị mmadụ na-eso Ihe Ọmụma dị ole na ole. Ị ga-ahụ ihe akaebe nke Ihe Ọmụma na ndụ ha, nke a ga-akpali gị ma chetara gị na Ihe Ọmụma bikwa n'ime gị, nakwa na ebe ọ bụla ị gara na ihe ọ bụla i mere, Chineke nọ ebe ahụ.

I nwere akọnuche dị omimi nke na-agwa gị mgbe ị na-eme ihe dị mma na mgbe ị na-eme ihe na-adịghị gị mma. Ka oge na-aga, ị ga-amụta na mgbe ị hụrụ njehie n'ime ndị ọzọ, ọ bụ ngosipụta na ha anọghị na Ihe Ọmụma, ị ga-ejikwa nke a mee ka nkwado gị nye Ihe Ọmụma sikwuo ike. Kama ịma onye ahụ ma ọ bụ ọnọdụ ahụ ikpe, ị ga-ahụ oke mkpa Ihe Ọmụma dị.

Site n'Ihe Ọmụma, agha na esemokwu agaghị adị. Ndị mmadụ nwere ike ikwenyeghị n'otu e si eme ihe, ma obi ha ga-adakọ banyere ihe a ga-eme, na ihe a ga-edozi. Ihe Ọmụma dị n'otu n'ime ndị mmadụ na n'etiti ndị mmadụ. Ọ bụ onye ukwu na-eme udo n'ụwa. Ọ bụ ike na-emeri agwa nke ịma ikpe, nke ibuso mmadụ agha, nke ime ihe naanị maka onwe onye na nke ịchọ imeri ndị ọzọ maka uru nke gị.

Ọ dị ka a ga-asị na i nwere ike ndị na-azọ ọkwa n'ime onwe gị. Ha dị nnọọ iche. Ha nwere ntụzịaka dị nnọọ iche. Ha na-eweta ahụmahụ na nghọta ndụ dị nnọọ iche. Ha na-eduga gị n'ụzọ dị iche iche.

Ya mere, kwa ụbọchị ị na-ahọrọ nke ị ga-eso, ihe ị ga-asọpụrụ na ihe ị ga-achọ n'ime onwe gị na n'ime ndị ọzọ. Ka nke a na-abụ ihe ị na-eme n'amamihe, mgbe ahụ ị ga-enwe mmetụta na i nwere ikike na ike ka ukwuu ikpebi ụdị ahụmahụ ị ga-enwe.

Ọ bụrụ na i soro Ihe Ọmụma, obi ga-adị gị mma, obi gị ga-adakọkwa na onwe gị. Ọ bụrụ na ị megide Ihe Ọmụma, ahụ agaghị eru gị ala, ọ ga-adị ka a ga-asị na a rara gị nye.

Ị nwere ike imegide Ihe Ọmụma maka ọtụtụ ihe dị iche iche: maka akụ; iji nweta ịma mma; iji nweta ndị mmadụ, ebe na ihe ndị dị iche iche. Ma n'ime onwe gị, obi agaghị adị gị mma banyere ya. Ọ bụrụ na ị họrọ iwe na ịma ndị ọzọ ikpe, obi ga-adị gị njọ nke ukwuu n'ime onwe gị. I nwere ike iche na i mere nke ọma, i nwere ike iche na ị bụ onye ziri ezi, ma obi ga-adị gị njọ n'ime onwe gị. A na-emerụ akọnuche gị dị omimi, obi ga-adịkwa gị njọ n'ime onwe gị.

Ị nwere ike ịgbalị ikepụta ụwa nke gị ma mee ka ndụ gị bụrụ ihe ọ bụla i chere na ọ kwesịrị ịbụ ma ọ bụ nke ị chọrọ ka ọ bụrụ, ma ị pụghị imerụ akọnuche gị dị omimi n'akpataghị nhụjuanya n'ime onwe gị.

Ebe a, a na-amata naanị ihe dị mma na ihe dị njọ. N'ime mgbagwoju anya nke ịgbalị idozi nsogbu na ihe isi ike, akọnuche a bụ isi nwere ike ịgbachi ọchịchịrị, o nwekwara ike isiwanye ike ịmata ụzọ ziri ezi a ga-eso. Ebe a ka ọgụgụ isi na-abịa n'ezigbo ije ozi ya. Ọ ga-ekpebirịrị otu e kwesịrị isi mee ka ihe mee. Ọ na-elekọta nkọwa nta nta, na-elekọta ihe ndị akọwapụtara, ma Ihe Ọmụma aghaghị ịkpebi ezigbo ntụzịaka.

I nwere ntọala ezi omume na ụkpụrụ ọma n'ime onwe gị nke Chineke kere. Ọ bụrụgodi na ọ na-ese okwu na ihe omenala gị kwenyere na ya na ihe ọha mmadụ kụziiri gị, a pụghị ịgbanwe ya. Omenala gị nwere ike ịkụziri gị ịma ndị ọzọ ikpe na ịta ndị ọzọ ahụhụ maka agwa ụfọdụ, ma ọ bụ ka ị ghara ịtụkwasị ndị otu ọzọ ma ọ bụ agbụrụ ọzọ ma ọ bụ mba ọzọ obi. Ma nke a bụ imerụ akọnuche gị dị omimi. Ya mere i nwere akọnuche ọha bụ ihe ọha mmadụ kụziiri gị, ma i nwekwara akọnuche dị omimi nke Chineke kere.

Ọ bụ nnukwu ngọzi nke ndụ gị na Nkewa apụghị izu oke mgbe ọ bụla, nakwa na ihe Chineke kere na-anọgide n'ime gị. Ọ bụ nke a ga-azọpụta gị. Ọ bụ nke a ga-eduzi gị ma gbochie gị inyefe ndụ gị na ime njehie ndị dị oke njọ.

Ụwa bụ ebe zuru oke ijikọtakwa na Ihe Ọmụma, n'ihi na mkpa ya dị ukwuu. Ma Ihe Ọmụma adịghị, ị fụrụ efu, naanị ọchịchọ gị na egwu gị na-eduzi gị.

Ọ dịghị mkpa ka ị bụrụ onye okpukpe. Ọ dịghị mkpa ka ị sonye n'otu okpukpe ma ọ bụ soro otu nkuzi okpukpe tupu ị laghachi n'ike na ọnụnọ nke Ihe Ọmụma dị n'ime gị. Ọ ga-ejere gị ozi n'ime odinala okpukpe ma ọ bụ na mpụga ya, n'ụwa ọ bụla, na mba ọ bụla, n'omenala ọ bụla, n'ọnọdụ ọ bụla.

Ma ebe a, ọtụtụ ndị mmadụ bụ ndị ọbịa nye onwe ha. Ịmatakwa ma jikọtakwa na Ihe Ọmụma bụ mkpa gị kacha bụrụ isi na ndụ. Gafee inweta nri na ebe obibi na ihe ndị bụ isi maka ịdị ndụ, nke a bụ mgbalị gị kacha bụrụ isi.

Ịzọ Nzọụkwụ Ruo n'Ihe Ọmụma, ịbụ nwa akwụkwọ nke Ihe Ọmụma, ịmụta Ụzọ nke Ihe Ọmụma bụ ịmụta ụzọ nke ndụ ka ukwuu. Ị chọrọ nke a kwa ụbọchị, na mkpebi gị ọ bụla. Ị chọrọ nke a iji gbanarị Hel nke i kepụtaara onwe gị—Hel nke enweghị ntụkwasị obi, Hel nke ikpe onwe gị ikpe, Hel nke enweghị nchekwa, Hel nke nchegbu, Hel nke egwu na Hel nke ịma onwe gị na ndị ọzọ ikpe.

Mgbe ị ghọtara na nke a bụ Hel, nakwa na ọ bụghị naanị ọnọdụ gị nkịtị, ị ga-amalite ileba anya nke ukwuu ka ị chọta ihe akaebe nke Ihe Ọmụma. Mgbe ị ghọtara ụdị nhụjuanya ị na-ahụ, ihe ị na-atụfu na ọnụ ọgụgụ njehie ị na-eme, ị ga-achọ ịchọta isi iyi nke obi siri ike n'ime onwe gị na n'ime ndị ọzọ. Ị ga-achọ ka obi siri ike a bụrụ ntọala mkpebi gị na ntọala mmekọrịta ọ bụla gị na onye ọzọ ga-enwe.

Chineke ezitela gị n'ụwa itinye aka nke onyinye pụrụ iche, nke gbasara ụfọdụ ndị mmadụ n'ụfọdụ ọnọdụ. Ị ga-achọtarịrị ndị mmadụ ndị a, ị ga-achọtakwarịrị ọnọdụ ndị a. Ị ga-enwe mmetụta na ọ dị ngwa ngwa ebe a. Ọ bụrụgodi na ị ghọtahiere mkpa ndị a dị omimi, ha ga-adị n'ime gị. Ha ga-eduga gị n'ihu.

N'oge ahụ niile, ị na-alụ ndị mmadụ, obi gị na-adọkwasị n'ebe ụfọdụ, ị na-enye ndụ gị nye ihe ụfọdụ. Ma mkpa ndị a dị omimi na-anọgide, ruo mgbe e mezuru ha, ị gaghị enwe izu ike, ị ga-eche na ndụ gị aghaghị ịga n'ihu, afọ agaghịkwa eju gị na ihe i nwere. N'ihi na ndị a na-anọchi anya mkpa mkpụrụ obi dị omimi, bụ mkpa ndị kachasị bụrụ isi n'ime gị.

Naanị site n'ịchọpụta na imezu nzube gị ka ukwuu ebe a ka a pụrụ imezu mkpa mkpụrụ obi. Ebe ọ bụ na ọgụgụ isi gị apụghị ịchọpụta nke a, ị ga-esorịrị nduzi nke Ihe Ọmụma. Ị ga-amụtakwarịrị banyere ike na ọnụnọ nke Ihe Ọmụma na ndụ gị.

Ọ dị nnọọ mfe n'ezie, ma ọ gaghị adị ka ihe dị mfe n'ihi na uche gị ga-agbagwoju anya. N'ihi na Ihe Ọmụma bụ ihe omimi, ọ naghị adaba n'echiche gị. Ị pụghị ịchịkwa ya; ị pụghị ịkọwa ya; ị pụghị iji okwu kọwaara ndị enyi gị ya, n'ihi na Ihe Ọmụma bụ ahụmahụ dị omimi nke ịhụ ụzọ, nke ịmata ihe na nke ime ihe. Ọ ga-adị ka ihe a na-adịghị ahụkebe ma na-agbagwoju anya na mbụ, ma ka oge na-aga ị ga-ahụ na ọ bụ ihe kachasị dị gị mma ime.

Nke a bụ njem gị n'ụwa. Ọ bụ njem ga-aga n'ihu gafee ụwa a. Ọ bụ njem ị pụghị iji naanị echiche kọwaa. Ihe Ọmụma ga-akpọrọ gị na njem a, ọ ga-enyekwa ndụ gị uru, nzube na ntụzịaka.

Ị ga-ahụ na e nwere iyi dị omimi na-asọ na ndụ gị. Gafee echiche gị niile na ihe ndị na-eme kwa ụbọchị, e nwere iyi dị omimi na-asọ na ndụ gị. Nke a bụ ihe ga-enye gị ike na nzube na amamihe ka ị na-aga n'ihu.

Ọ dị mkpa ebe a ka ị ghọta na onye ị bụ abụghị uche gị, abụghị echiche gị, abụghị nkwenye gị, nakwa na ezigbo ịdị adị gị karịrị ha—karịrị ihe ndị a, nakwa na Chineke karịrị ihe ndị a. Echiche apụghị ịnọchi anya ezigbo mmekọrịta. Ezigbo mmekọrịta na-agafekwa echiche gị. Ezigbo mmekọrịta gị na Chineke na-agafe echiche gị, ma ọ bụ echiche nke omenala gị ma ọ bụ nke okpukpe gị.

Ka oge na-aga, ị ga-akwaga nkwado gị n'ike nke Ihe Ọmụma. Nke a bụ ịkwaga nkwado gị nye Chineke. Nke a bụ ịkagbu Nkewa n'isi ntọala nke Ọdịdị gị.

Ebe a, ị nwere ike iji uche rụọ ọrụ kama ka ọ chịa gị. Ebe a, ị nwere ike iji echiche na nkọwa rụọ ọrụ kama ka ha chịa gị. Ebe a, ị ga-enwe ike iji ikike magburu onwe ha nke ọgụgụ isi gị na nke ahụ gị rụọ ọrụ kama ịbụ ohu ha.

Nke a bụ ụdị nnwere onwe nke a pụrụ ime, ọ ga-akpọghachikwa gị n'ọdịdị gị kacha bụrụ isi, nakwa na nzube ka ukwuu nke butere gị ebe a, n'ime ụwa, n'oge a.
